Malachi 2

Ndụmọdụ ndị ọzọ nye ndị nchụaja

1“Ma ugbu a, unu ndị nchụaja, ịdọ aka na ntị a dịrị unu. 2Ọ bụrụ na unu ajụ ige ntị, ọ bụrụkwa na unu ekpebighị nʼobi unu inye aha m otuto,” ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, na-ekwu, “Aga m ezite ọbụbụ ọnụ nʼahụ unu, aga m abụkwa ngọzị unu niile ọnụ. E, abụọlarị unu ọnụ, nʼihi na unu ekpebighị nʼobi unu ịsọpụrụ m.

3“Nʼihi unu, aga m abara ụmụ ụmụ unu mba.
Maọbụ, kpọnwụsịa mkpụrụ ọghịgha unu
Agaghị m anabata onyinye unu, aga m efesakwa nsị anụ nʼihu unu, bụ nsị nke ihe onyinye unu, aga m ewezugakwa unu site nʼihu m.
4Otu a ka unu ga-esi mara na ọ bụ mụ zitere unu ịdọ aka na ntị a, ka ọgbụgba ndụ mụ na Livayị gbara dịgide,” Ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, na-ekwu. 5“Ọgbụgba ndụ mụ na ya bụ nke ndụ na udo, ọ bụ m nyere ha ya, nke a bụ nʼihi nsọpụrụ. O nyere m nsọpụrụ nʼezie, tụkwaa aha m egwu. 6Iwu nke eziokwu dị ya nʼọnụ, ọ dịkwaghị okwu ụgha ọbụla a chọpụtara nʼegbugbere ọnụ ya. O soro m jee ije nʼudo, na nʼịkwụba aka ọtọ. O mekwara ka ọtụtụ si nʼajọ omume ha chigharịa.

7“Nʼihi na egbugbere ọnụ onye nchụaja kwesiri ijupụta nʼihe ọmụma; e kwesikwara isi nʼọnụ ya mụta ihe, nʼihi na ọ bụ onyeozi nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile. 8Ma unu esitela nʼụzọ ahụ wezuga onwe unu, sitekwa nʼozizi unu mee ka ọtụtụ mmadụ sụọ ngọngọ. Unu emerụọla ọgbụgba ndụ nke Livayị.” Ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. 9“Nʼihi nke a, emeela m ka unu bụrụ ndị a na-elelị anya, na ndị e wedara nʼala nʼihu ndị mmadụ niile, nʼihi na unu agbasoghị ụzọ m, kama unu na-ele mmadụ anya nʼihu, nʼihe metụtara iwu.”

Imebi ọgbụgba ndụ site nʼịgba alụkwaghị m

10Ọ bụghị otu Nna ka anyị niile nwere? Ọ bụghị otu Chineke ahụ kere anyị? Gịnị mere anyị ji na-emerụ ọgbụgba ndụ nna anyị ha site na-enweghị ntụkwasị obi na mmekọrịta anyị na ibe anyị?

11Juda ekwesighị ntụkwasị obi. E meela ihe arụ nʼIzrel na nʼime Jerusalem: Juda emerụọla ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị hụrụ nʼanya, lụọkwa ada chi ndị mba ọzọ. 12Ka Onyenwe anyị kewapụ onye mere ihe dị otu a nʼụlọ ikwu Jekọb, ka ọ ghara inwe onye akaebe, ka ọ ghara inwe onye ga-aza ya mgbe ọ kpọrọ oku maọbụ butere Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile onyinye.

13Ihe ọzọ unu na-emekwa bụ ndị a: unu na-eme ka anya mmiri unu jupụta nʼebe ịchụ aja Onyenwe anyị. Unu na-akwa akwa, na-eti mkpu akwa nʼihi na ọ naghị elenye anya nʼonyinye unu, maọbụ jiri obi ụtọ nabata ha. 14Unu na-asị “Nke a ọ bụ nʼihi gịnị?” Ọ bụ nʼihi na Onyenwe anyị bụ onyeama nʼetiti gị na nwunye ị lụrụ nʼokorobịa gị, nʼihi na ị kwesighị ntụkwasị obi, ọ bụ ezie na ọ bụ nwanyị e jikọtara gị na ya, bụrụkwa nwunye ọgbụgba ndụ gị.

15Ọ bụ na ọ bụghị otu Chineke ahụ kere gị? Nʼanụ ahụ na nʼime mmụọ, unu bụ nke ya. Ma gịnị ka otu Chineke a chọrọ? Ka unu bụrụ ụmụ na-atụ ya egwu. Ya mere, jie mmụọ gị aka, ka ị gharakwa ịbụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nʼebe nwunye ị lụtara nʼokorobịa nọ.

16“Akpọrọ m ịgba alụkwaghị m asị,” ka Onyenwe anyị Chineke nke Izrel sịrị, “a kpọkwara nwoke na-emeso nwunye ya mmeso nʼụzọ ihe ike asị.” Ọ bụ Onyenwe Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu.

Ya mere, kpachapụrụnụ onwe unu anya, unu abụkwala ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi.

Imebi ọgbụgba ndụ site nʼikpe mmegide

17Unu esitela nʼoke okwu unu mee ka ike gwụ Onyenwe anyị.

Ma unu na-ajụ, “Olee ụzọ anyị si mee ka ike gwụ ya?”

Mgbe unu na-asị, “Ndị niile na-eme ihe ọjọọ dị mma nʼanya Onyenwe anyị. Ihe ha na-atọkwa ya ụtọ,” maọbụ na-asịkwa, “Ebee ka Chineke ahụ na-ekpe ikpe ziri ezi nọ?”

Copyright information for IboBIU